Jeremaya 5:25
Jeremiah 5:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka. Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
Jeremiah 5:25 in English
Jeremiah 5:25 · Berean Standard Bible
Your iniquities have diverted these from you; your sins have deprived you of My bounty.
Context
23Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
Ha atụgharịala wezuga onwe ha. 24Ha adịghị asị onwe ha,
‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,
ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’ 25Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu. 26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,
dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ. 27Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,
ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ.
Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.