Jeremaya 5:24
Jeremiah 5:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
Jeremiah 5:24 in English
Jeremiah 5:24 · Berean Standard Bible
They have not said in their hearts, ‘Let us fear the LORD our God, who gives the rains, both autumn and spring, in season, who keeps for us the appointed weeks of harvest.’
Context
22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”
“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?
Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.
Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.
Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.
Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ. 23Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
Ha atụgharịala wezuga onwe ha. 24Ha adịghị asị onwe ha,
‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,
ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’ 25Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu. 26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,
dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.