Jeremaya 5:23
Jeremiah 5:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
Jeremiah 5:23 in English
Jeremiah 5:23 · Berean Standard Bible
But these people have stubborn and rebellious hearts. They have turned aside and gone away.
Context
21Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,
na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe. 22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”
“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?
Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.
Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.
Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.
Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ. 23Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
Ha atụgharịala wezuga onwe ha. 24Ha adịghị asị onwe ha,
‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,
ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’ 25Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.