Jeremaya 49:37
Jeremiah 49:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.
Jeremiah 49:37 in English
Jeremiah 49:37 · Berean Standard Bible
So I will shatter Elam before their foes, before those who seek their lives. I will bring disaster upon them, even My fierce anger,” declares the LORD. “I will send out the sword after them until I finish them off.
Context
35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m agbaji ụta nke Elam,
bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị. 36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ,
nke ga-abịa megide Elam.
Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a,
ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche,
ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha. 37Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha,
e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike.
Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha,
meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ
tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa. 38Aga m edo ocheeze m nʼElam,
bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 39“Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,
aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
49:10 Agaghị ahapụrụ ya ihe ọbụla
49:10 Maọbụ, ndị ikom ya ji ngwa agha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.