Native Bible

Jeremiah 49:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m edo ocheeze m nʼElam, bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 49:38 in English

Jeremiah 49:38 · Berean Standard Bible

I will set My throne in Elam, and destroy its king and officials,” declares the LORD.

Context

36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha. 37Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa. 38Aga m edo ocheeze m nʼElam, bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 39“Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 49:10 Agaghị ahapụrụ ya ihe ọbụla 49:10 Maọbụ, ndị ikom ya ji ngwa agha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.