Jeremaya 48:20
Jeremiah 48:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
Jeremiah 48:20 in English
Jeremiah 48:20 · Berean Standard Bible
Moab is put to shame, for it has been shattered. Wail and cry out! Declare by the Arnon that Moab is destroyed.
Context
18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata,
bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ,
unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn.
Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab
ga-abịa ibu agha megide unu,
ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi. 19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme,
unu ndị bi nʼime Aroea.
Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ
sị ha, ‘Gịnị mere?’ 20E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya.
Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa.
Kwupụta ya nʼAnọn
na e bibiela Moab. 21Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala,
bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat, 22Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.