Native Bible

Jeremiah 48:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’

Jeremiah 48:19 in English

Jeremiah 48:19 · Berean Standard Bible

Stand by the road and watch, O dweller of Aroer! Ask the man fleeing or the woman escaping, ‘What has happened?’

Context

17Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’ 18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi. 19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’ 20E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab. 21Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.