Jeremaya 48:19
Jeremiah 48:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’
Jeremiah 48:19 in English
Jeremiah 48:19 · Berean Standard Bible
Stand by the road and watch, O dweller of Aroer! Ask the man fleeing or the woman escaping, ‘What has happened?’
Context
17Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu,
unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu.
Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike,
lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’ 18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata,
bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ,
unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn.
Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab
ga-abịa ibu agha megide unu,
ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi. 19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme,
unu ndị bi nʼime Aroea.
Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ
sị ha, ‘Gịnị mere?’ 20E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya.
Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa.
Kwupụta ya nʼAnọn
na e bibiela Moab. 21Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala,
bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.