Jeremaya 48:17
Jeremiah 48:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
Jeremiah 48:17 in English
Jeremiah 48:17 · Berean Standard Bible
Mourn for him, all you who surround him, everyone who knows his name; tell how the mighty scepter is shattered— the glorious staff!
Context
15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha.
Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu* ahụ.”
Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 16“Ọdịda Moab dị nso;
oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ. 17Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu,
unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu.
Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike,
lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’ 18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata,
bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ,
unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn.
Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab
ga-abịa ibu agha megide unu,
ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi. 19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ* ihe na-eme,
unu ndị bi nʼime Aroea.
Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ
sị ha, ‘Gịnị mere?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.