Jeremaya 48:15
Jeremiah 48:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu* ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Jeremiah 48:15 in English
Jeremiah 48:15 · Berean Standard Bible
Moab has been destroyed and its towns have been invaded; the best of its young men have gone down in the slaughter, declares the King, whose name is the LORD of Hosts.
Context
13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab,
dịka ihere si mee Izrel
mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha. 14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ;
anyị bụkwa dimkpa nʼagha’? 15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha.
Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu* ahụ.”
Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 16“Ọdịda Moab dị nso;
oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ. 17Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu,
unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu.
Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike,
lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.