Jeremaya 48:16
Jeremiah 48:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
Jeremiah 48:16 in English
Jeremiah 48:16 · Berean Standard Bible
Moab’s calamity is at hand, and his affliction is rushing swiftly.
Context
14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ;
anyị bụkwa dimkpa nʼagha’? 15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha.
Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu* ahụ.”
Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 16“Ọdịda Moab dị nso;
oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ. 17Kasịenụ* ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu,
unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu.
Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike,
lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’ 18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata,
bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ,
unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn.
Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab
ga-abịa ibu agha megide unu,
ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.