Jeremaya 47:5
Jeremiah 47:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?
Jeremiah 47:5 in English
Jeremiah 47:5 · Berean Standard Bible
The people of Gaza will shave their heads in mourning; Ashkelon will be silenced. O remnant of their valley,* how long will you gash yourself?
Context
3Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ,
mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro,
na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha.
Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka,
nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha. 4Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala
mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,
mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,
ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.
Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,
o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto. 5Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.
A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,
unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị? 6“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,
ole mgbe ị ga-ezu ike?
Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,
kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’ 7Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,
ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu
ibu agha megide Ashkelọn,
na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.