Jeremaya 47
Jeremiah 47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu;
ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke.
Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya,
ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya.
Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa,
mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike. 3Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ,
mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro,
na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha.
Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka,
nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha. 4Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala
mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,
mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,
ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.
Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,
o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto. 5Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.
A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,
unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị? 6“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,
ole mgbe ị ga-ezu ike?
Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,
kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’ 7Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,
ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu
ibu agha megide Ashkelọn,
na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.