Jeremaya 47:6
Jeremiah 47:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’
Jeremiah 47:6 in English
Jeremiah 47:6 · Berean Standard Bible
‘Alas, O sword of the LORD, how long until you rest? Return to your sheath; cease and be still!’
Context
4Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala
mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,
mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,
ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.
Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,
o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto. 5Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.
A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,
unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị? 6“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,
ole mgbe ị ga-ezu ike?
Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,
kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’ 7Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,
ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu
ibu agha megide Ashkelọn,
na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.