Jeremaya 39:5
Jeremiah 39:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.
Jeremiah 39:5 in English
Jeremiah 39:5 · Berean Standard Bible
But the army of the Chaldeans * pursued them and overtook Zedekiah in the plains of Jericho. They seized him and brought him up to Nebuchadnezzar king of Babylon at Riblah in the land of Hamath, where he pronounced judgment on him.
Context
3Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ. 4Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.* 5Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe. 6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ. 7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.