Jeremaya 39:3
Jeremiah 39:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.
Jeremiah 39:3 in English
Jeremiah 39:3 · Berean Standard Bible
Then all the officials of the king of Babylon entered and sat in the Middle Gate: Nergal-sharezer of Samgar, Nebo-sarsekim * the Rabsaris,* Nergal-sharezer the Rabmag,* and all the rest of the officials of the king of Babylon.
Context
1Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya. 2Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ. 3Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ. 4Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.* 5Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.