Native Bible

Jeremiah 39:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya.

Jeremiah 39:1 in English

Jeremiah 39:1 · Berean Standard Bible

In the ninth year of Zedekiah king of Judah, in the tenth month, Nebuchadnezzar king of Babylon marched against Jerusalem with his entire army and laid siege to the city.

Context

1Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya. 2Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ. 3Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.