Native Bible

Jeremiah 39:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ.

Jeremiah 39:6 in English

Jeremiah 39:6 · Berean Standard Bible

There at Riblah the king of Babylon slaughtered the sons of Zedekiah before his eyes, and he also killed all the nobles of Judah.

Context

4Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.* 5Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe. 6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ. 7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn. 8Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.