Jeremaya 39:8
Jeremiah 39:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.
Jeremiah 39:8 in English
Jeremiah 39:8 · Berean Standard Bible
The Chaldeans set fire to the palace of the king and to the houses of the people, and they broke down the walls of Jerusalem.
Context
6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ. 7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn. 8Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem. 9Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha. 10Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.