Jeremaya 39:7
Jeremiah 39:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
Jeremiah 39:7 in English
Jeremiah 39:7 · Berean Standard Bible
Then he put out Zedekiah’s eyes and bound him with bronze chains to take him to Babylon.
Context
5Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe. 6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ. 7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn. 8Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem. 9Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.