Jeremaya 33:16
Jeremiah 33:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo.* Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’*
Jeremiah 33:16 in English
Jeremiah 33:16 · Berean Standard Bible
In those days Judah will be saved, and Jerusalem will dwell securely, and this is the name by which it will be called: The LORD Our Righteousness.*
Context
14“ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda. 15“ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ,
aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 16Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda,
Jerusalem ga-ebikwa nʼudo.*
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya,
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’* 17Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel. 18Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.