Native Bible

Jeremiah 33:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.

Jeremiah 33:17 in English

Jeremiah 33:17 · Berean Standard Bible

For this is what the LORD says: David will never lack a man to sit on the throne of the house of Israel,

Context

15“ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 16Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo.* Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’* 17Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel. 18Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ” 19Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.