Jeremaya 33:18
Jeremiah 33:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”
Jeremiah 33:18 in English
Jeremiah 33:18 · Berean Standard Bible
nor will the priests who are Levites ever fail to have a man before Me to offer burnt offerings, to burn grain offerings, and to present sacrifices.”
Context
16Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda,
Jerusalem ga-ebikwa nʼudo.*
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya,
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’* 17Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel. 18Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ” 19Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 20“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.