Jeremaya 31:36
Jeremiah 31:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
Jeremiah 31:36 in English
Jeremiah 31:36 · Berean Standard Bible
“Only if this fixed order departed from My presence, declares the LORD, would Israel’s descendants ever cease to be a nation before Me.”
Context
34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu
ka ha na-enye ihe nʼanyasị,
onye na-akpali oke osimiri,
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.” 37Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,
na ịdị omimi nke ntọala ụwa,
ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,
nʼihi ihe* niile ha mere.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 38“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.