Jeremaya 31:34
Jeremiah 31:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Jeremiah 31:34 in English
Jeremiah 31:34 · Berean Standard Bible
No longer will each man teach his neighbor or his brother, saying, ‘Know the LORD,’ because they will all know Me, from the least of them to the greatest, declares the LORD. For I will forgive their iniquities and will remember their sins no more.”*
Context
32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu
ka ha na-enye ihe nʼanyasị,
onye na-akpali oke osimiri,
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.