Native Bible

Jeremiah 31:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 31:32 in English

Jeremiah 31:32 · Berean Standard Bible

It will not be like the covenant I made with their fathers when I took them by the hand to lead them out of the land of Egypt— a covenant they broke, though I was a husband to them,*” declares the LORD.

Context

30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.