Jeremaya 31:32
Jeremiah 31:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 31:32 in English
Jeremiah 31:32 · Berean Standard Bible
It will not be like the covenant I made with their fathers when I took them by the hand to lead them out of the land of Egypt— a covenant they broke, though I was a husband to them,*” declares the LORD.
Context
30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda. 32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.