Jeremaya 31:30
Jeremiah 31:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
Jeremiah 31:30 in English
Jeremiah 31:30 · Berean Standard Bible
Instead, each will die for his own iniquity. If anyone eats the sour grapes, his own teeth will be set on edge.
Context
28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,
“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,
ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’ 30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda. 32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.