Jeremaya 31:29
Jeremiah 31:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
Jeremiah 31:29 in English
Jeremiah 31:29 · Berean Standard Bible
“In those days, it will no longer be said: ‘The fathers have eaten sour grapes, and the teeth of the children are set on edge.’
Context
27Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. 28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,
“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,
ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’ 30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.