Jeremaya 31:37
Jeremiah 31:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe* niile ha mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 31:37 in English
Jeremiah 31:37 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “Only if the heavens above could be measured and the foundations of the earth below searched out would I reject all of Israel’s descendants because of all they have done,” declares the LORD.
Context
35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu
ka ha na-enye ihe nʼanyasị,
onye na-akpali oke osimiri,
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.” 37Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,
na ịdị omimi nke ntọala ụwa,
ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,
nʼihi ihe* niile ha mere.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 38“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. 39Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.