Jeremaya 30:5
Jeremiah 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
Jeremiah 30:5 in English
Jeremiah 30:5 · Berean Standard Bible
Yes, this is what the LORD says: “A cry of panic is heard— a cry of terror, not of peace.
Context
3Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.” 4Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda. 5“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,
nke oke egwu, ọ bụghị udo. 6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,
nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?
Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike
ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,
ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ? 7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.
O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.
Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,
ma a ga-anapụta ya site na ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.