Jeremaya 30:3
Jeremiah 30:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
Jeremiah 30:3 in English
Jeremiah 30:3 · Berean Standard Bible
For behold, the days are coming, declares the LORD, when I will restore from captivity * My people Israel and Judah, declares the LORD. I will restore them to the land that I gave to their fathers, and they will possess it.’”
Context
1Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2“Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ. 3Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.” 4Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda. 5“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,
nke oke egwu, ọ bụghị udo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.