Jeremaya 3:4
Jeremiah 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
Jeremiah 3:4 in English
Jeremiah 3:4 · Berean Standard Bible
Have you not just called to Me, ‘My Father, You are my friend from youth.
Context
2“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a,
olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko?
Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko,*
na-anọkwa dịka onye Arebịa* nʼọzara.
Ị werela ịkwa iko gị niile
na ihe ọjọọ gị merụọ ala a. 3Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu,
ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị.
Nʼihi na unu bụ ndị akwụna,
ndị ihere na-adịghị eme. 4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m,
‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị. 5Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile?
Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’
Otu a ka unu si ekwu okwu,
ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.” 6Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.