Native Bible

Jeremiah 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”

Jeremiah 3:5 in English

Jeremiah 3:5 · Berean Standard Bible

Will He be angry forever? Will He be indignant to the end?’ This you have spoken, but you keep doing all the evil you can.”

Context

3Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme. 4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị. 5Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.” 6Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ. 7Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.