Jeremaya 3:6
Jeremiah 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
Jeremiah 3:6 in English
Jeremiah 3:6 · Berean Standard Bible
Now in the days of King Josiah, the LORD said to me, “Have you seen what faithless Israel has done? She has gone up on every high hill and under every green tree to prostitute herself there.
Context
4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m,
‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị. 5Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile?
Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’
Otu a ka unu si ekwu okwu,
ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.” 6Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ. 7Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya. 8Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.