Jeremaya 3:23
Jeremiah 3:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
Jeremiah 3:23 in English
Jeremiah 3:23 · Berean Standard Bible
Surely deception comes from the hills, and commotion from the mountains. Surely the salvation of Israel is in the LORD our God.
Context
21A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu.
Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ
nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie;
ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha. 22“Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ.
Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.”*
Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị
nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị. 23Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile,
nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ,
nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị
ka nzọpụta Izrel dị. 24Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala
mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha
igwe anụ ụlọ na ehi ha,
ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom. 25Ka anyị dinara ala nʼihere anyị,
ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị.
Anyị na nna nna anyị ha
emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị;
site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa
o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”
3:2 Ya bụ, dịka nwanyị akwụna
3:2 Onye na-achịgharị anụ ụlọ
3:22 Ga-eme unu ndị kwesiri ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.