Native Bible

Jeremiah 3:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.

Jeremiah 3:24 in English

Jeremiah 3:24 · Berean Standard Bible

From our youth, that shameful god has consumed what our fathers have worked for— their flocks and herds, their sons and daughters.

Context

22“Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.”* Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị. 23Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị. 24Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom. 25Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.” 3:2 Ya bụ, dịka nwanyị akwụna 3:2 Onye na-achịgharị anụ ụlọ 3:22 Ga-eme unu ndị kwesiri ntụkwasị obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.