Jeremaya 23:6
Jeremiah 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.*
Jeremiah 23:6 in English
Jeremiah 23:6 · Berean Standard Bible
In His days Judah will be saved, and Israel will dwell securely. And this is His name by which He will be called: The LORD Our Righteousness.*
Context
4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
Izrel ga-ebikwa nʼudo.
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.* 7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ 8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.