Jeremaya 23:7
Jeremiah 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
Jeremiah 23:7 in English
Jeremiah 23:7 · Berean Standard Bible
So behold, the days are coming, declares the LORD, when they will no longer say, ‘As surely as the LORD lives, who brought the Israelites up out of the land of Egypt.’
Context
5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
Izrel ga-ebikwa nʼudo.
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.* 7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ 8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.” 9Ma banyere ndị amụma,
obi m na-agbawa nʼime m,
ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.
Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,
dịka onye ṅụbigara mmanya oke,
nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,
na site nʼokwu nsọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.