Jeremaya 23:5
Jeremiah 23:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
Jeremiah 23:5 in English
Jeremiah 23:5 · Berean Standard Bible
Behold, the days are coming, declares the LORD, when I will raise up for David * a righteous Branch, and He will reign wisely as King and will administer justice and righteousness in the land.
Context
3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
Izrel ga-ebikwa nʼudo.
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.* 7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.