Native Bible

Jeremiah 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

Jeremiah 23:3 in English

Jeremiah 23:3 · Berean Standard Bible

Then I Myself will gather the remnant of My flock from all the lands to which I have banished them, and I will return them to their pasture, where they will be fruitful and multiply.

Context

1“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 2Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.