Jeremaya 23:26
Jeremiah 23:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
Jeremiah 23:26 in English
Jeremiah 23:26 · Berean Standard Bible
How long will this continue in the hearts of these prophets who prophesy falsehood, these prophets of the delusion of their own minds?
Context
24“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo
nke m na-enweghị ike ịhụ anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi? 27Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal. 28Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.