Jeremaya 23:25
Jeremiah 23:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
Jeremiah 23:25 in English
Jeremiah 23:25 · Berean Standard Bible
“I have heard the sayings of the prophets who prophesy lies in My name: ‘I had a dream! I had a dream!’
Context
23“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,
ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 24“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo
nke m na-enweghị ike ịhụ anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi? 27Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.