Native Bible

Jeremiah 23:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 23:24 in English

Jeremiah 23:24 · Berean Standard Bible

“Can a man hide in secret places where I cannot see him?” declares the LORD. “Do I not fill the heavens and the earth?” declares the LORD.

Context

22A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 23“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 24“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.