Jeremaya 22:7
Jeremiah 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
Jeremiah 22:7 in English
Jeremiah 22:7 · Berean Standard Bible
I will appoint destroyers against you, each man with his weapons, and they will cut down the choicest of your cedars and throw them into the fire.
Context
5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” 6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,
“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,
dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,
aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,
dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. 7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,
tụnye ha niile nʼime ọkụ. 8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ 9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.