Jeremaya 22:5
Jeremiah 22:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”
Jeremiah 22:5 in English
Jeremiah 22:5 · Berean Standard Bible
But if you do not obey these words, then I swear by Myself, declares the LORD, that this house will become a pile of rubble.’”
Context
3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. 4Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. 5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” 6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,
“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,
dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,
aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,
dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. 7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,
tụnye ha niile nʼime ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.