Native Bible

Jeremiah 22:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.

Jeremiah 22:4 in English

Jeremiah 22:4 · Berean Standard Bible

For if you will indeed carry out these commands, then kings who sit on David’s throne will enter through the gates of this palace riding on chariots and horses—they and their officials and their people.

Context

2‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. 3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. 4Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. 5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” 6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.