Jeremaya 22:9
Jeremiah 22:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”
Jeremiah 22:9 in English
Jeremiah 22:9 · Berean Standard Bible
Then people will reply, ‘Because they have forsaken the covenant of the LORD their God and have worshiped and served other gods.’”
Context
7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,
tụnye ha niile nʼime ọkụ. 8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ 9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ” 10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,
kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;
ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ. 11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.