Jeremaya 11:14
Jeremiah 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.
Jeremiah 11:14 in English
Jeremiah 11:14 · Berean Standard Bible
As for you, do not pray for these people. Do not raise up a cry or a prayer on their behalf, for I will not be listening when they call out to Me in their time of disaster.
Context
12Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha. 13Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’ 14“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha. 15“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m,
mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ?
Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu.
A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ
mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.” 16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ,
nke na-amị mkpụrụ mara mma.
Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo
ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ;
alaka gị ga-agbajisikwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.