Jeremaya 11:15
Jeremiah 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”
Jeremiah 11:15 in English
Jeremiah 11:15 · Berean Standard Bible
What right has My beloved in My house, having carried out so many evil schemes? Can consecrated meat avert your doom, so that you can rejoice?
Context
13Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’ 14“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha. 15“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m,
mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ?
Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu.
A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ
mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.” 16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ,
nke na-amị mkpụrụ mara mma.
Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo
ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ;
alaka gị ga-agbajisikwa. 17Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.