Native Bible

Jeremiah 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’

Jeremiah 11:13 in English

Jeremiah 11:13 · Berean Standard Bible

Your gods are indeed as numerous as your cities, O Judah; the altars of shame you have set up—the altars to burn incense to Baal—are as many as the streets of Jerusalem.’

Context

11Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị. 12Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha. 13Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’ 14“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha. 15“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.