Native Bible

Jeremiah 11:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị.

Jeremiah 11:11 in English

Jeremiah 11:11 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the LORD says: ‘I am about to bring upon them a disaster that they cannot escape. They will cry out to Me, but I will not listen to them.

Context

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. 10Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ Izrel na ụlọ Juda adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara. 11Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị. 12Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha. 13Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.